-
Ọpụpụ 30:12-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 “Mgbe ọ bụla ị gụrụ ụmụ nwoke Izrel ọnụ ka ị mata ole ha dị,+ onye ọ bụla n’ime ha ga-enye Jehova ihe ọ ga-eji gbara ndụ* ya mgbe a na-agụ ha ọnụ, ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ime ha mgbe a na-edeba aha ha n’akwụkwọ. 13 Ihe a bụ ihe onye ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ ga-enye: ọkara shekel* e ji shekel dị n’ebe nsọ*+ tụọ. Gira* iri abụọ bụ otu shekel. Ọ bụ ọkara shekel bụ onyinye a na-enye Jehova.+ 14 Onye ọ bụla e debara aha ya n’akwụkwọ, bụ́ onye dị afọ iri abụọ ma ọ bụ karịa, ga-enye Jehova onyinye.+ 15 Ọgaranya agaghị enye ihe karịrị ọkara shekel,* ogbenye agaghịkwa enye ihe dị ala karịa ọkara shekel ka ọ bụrụ onyinye ọ na-enye Jehova iji gbara ndụ* ya. 16 Ị ga-anata ndị Izrel ego ọlaọcha ahụ ha ji gbara ndụ ha, jiri ya kwado ọrụ a na-arụ n’ụlọikwuu nzute, ka o wee bụụrụ ụmụ Izrel ihe ncheta n’ihu Jehova, ka ọ bụrụ ihe unu ji agbara ndụ* unu.”
-