-
1 Ndị Eze 3:5-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 Na Gibiọn, Jehova mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ, sịkwa ya: “Rịọ m ihe ị chọrọ ka m nye gị.”+ 6 Solomọn asị: “I gosiri ohu gị Devid nna m na ị hụrụ ya nnọọ n’anya* maka otú o si rubere gị isi, kpaa àgwà dị mma, ma jiri obi ọcha ya jeere gị ozi. Ruokwa taa, ị kwụsịbeghị igosi na ị hụrụ ya nnọọ n’anya, n’ihi na i nyere ya nwa nwoke ka ọ nọchie n’ocheeze ya.+ 7 Jehova bụ́ Chineke m, i meela mụnwa bụ́ ohu gị eze, ka m nọchie Devid nna m, n’agbanyeghị na m ka bụ nwata, o nweghịkwa ihe m ma.*+ 8 Ohu gị so ná ndị gị ị họọrọ,+ ndị a na-enweghị ike ịgụta ọnụ maka na ha karịrị akarị. 9 Biko, nyere ohu gị aka ka o jiri obi ya niile na-erubere gị isi, ka o nwee ike ịna-ekpe ndị gị ikpe,+ na-amata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ,+ n’ihi na ònye ga-ekpeli ndị gị a dị ọtụtụ* ikpe ma ọ bụrụ na i nyereghị ya aka?”
-