17 N’ụbọchị ndị ahụ, ndị a ma ama+ na Juda nọ na-ezigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, Tobaya ana-azaghachikwa ha. 18 Ọtụtụ ndị bi na Juda ṅụrụ iyi na ha ga na-akwado ya n’ihi na ọ bụ ya lụrụ nwa Shekanaya nwa Era.+ Jehohenan nwa ya nwoke lụkwara nwa Meshọlam+ nwa Berekaya.