-
Ọpụpụ 2:23-25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 Mgbe ogologo oge* gachara, eze Ijipt nwụrụ.+ Ma ndị Izrel ka nọ na-asụ ude maka na e ji ha mere ndị ohu, ha na-ebekwa ákwá arịrị. Ha nọkwa na-ebesara ezi Chineke ákwá ka o nyere ha aka maka na e ji ha mere ndị ohu.+ 24 Ka oge na-aga, Chineke nụrụ ude ha na-asụ.+ Chineke chetara ọgbụgba ndụ ya na Ebreham, Aịzik, na Jekọb.+ 25 Chineke wee lebara ndị Izrel anya ma hụ ahụhụ ha na-ata.
-