10 N’ụbọchị unu guzo n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu na Horeb, Jehova sịrị m, ‘Kpọkọtara m ndị a niile ka m mee ka ha nụ okwu m,+ ka ha wee mụta ịtụ egwu m+ n’oge niile ha ga-adị ndụ n’ala ahụ, ka ha kụziekwara ya ụmụ ha.’+
36 O mere ka unu nụ olu ya mgbe o si n’eluigwe na-agwa unu okwu ka ọ dọọ unu aka ná ntị. O mekwara ka unu hụ oké ọkụ ya n’ụwa, unu sikwa n’ọkụ nụ olu ya.+