12 Jehoyakin eze Juda, nne ya, ndị na-ejere ya ozi, ndị o mere ndị isi, na ndị na-eje ozi n’obí ya+ chịliiri eze Babịlọn aka+ elu, eze Babịlọn akpụrụkwa ya laa n’afọ nke asatọ eze Babịlọn malitere ịchị.+
14 Eze Babịlọn dọọrọ ndị Jeruselem niile n’agha, ma ndị isi niile+ ma ndị dike niile bụ́ ndị agha ma ndị omenkà niile ma ndị niile na-akpụ ụ́zụ́.*+ Ọ dọọrọ puku mmadụ iri (10,000) n’agha. E nweghị onye ọ hapụrụ ma e wezụga ndị ogbenye ọnụ ntụ.+