-
Nehemaya 10:28, 29Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
28 Ndị ọzọ kwetakwara ihe ahụ e kpebiri. Ha bụ ndị nchụàjà, ndị Livaị, ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, ndị na-abụ abụ, ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ,* ndị niile kwụsịrị iso ndị bi n’ala ndị a emekọ ihe ka ha wee na-edebe Iwu ezi Chineke,+ ha na ndị nwunye ha, ụmụ ha ndị nwoke, na ụmụ ha ndị nwaanyị, na ndị niile ọzọ ma ihe ma na-aghọta ihe.* 29 Ha so ụmụnne ha, bụ́ ndị a ma ama, ṅụọ iyi ka ihe ọjọọ mee ha ma ọ bụrụ na ha edebeghị Iwu Jehova Onyenwe anyị, bụ́ ezi Chineke, nke o si n’aka Mosis ohu ezi Chineke nye ndị Izrel nakwa ma ọ bụrụ na ha erubeghị isi n’iwu ya niile, n’ihe ndị o kpebiri, nakwa ná ntụziaka ya.
-