10 Anụkwara m oké olu nke si n’eluigwe sị:
“Chineke anyị azọpụtala ndị mmadụ!+ O ji ike ya merie! Alaeze ya amalitela ịchị!+ Kraịst ya amalitela iji ikike o nwere akpa ike, n’ihi na a chụdala onye na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị!+