39 ‘Unu ga-adụnye ihe ahụ dị yọrị yọrị ka unu na-ahụ ya wee na-echeta ihe niile Jehova nyere n’iwu ma na-eme ha.+ Unu esokwala obi unu na anya unu, bụ́ ihe ndị na-eme ka unu kpaa àgwà ka ndị akwụna hapụ m fewe chi ọzọ.+
9 Nwa okorobịa, ṅụrịa ọṅụ n’oge ị bụ okorobịa, nweekwa obi ụtọ n’oge ị na-eto eto. Mee ihe ndị dị gị n’obi, gaakwa ebe ọ bụla dị mma n’anya gị. Ma, mara na ezi Chineke ga-ekpe gị ikpe maka ihe niile a.+
9 Ndị unu a na-egbughị ga-echeta m ná mba niile a dọọrọ ha n’agha laa.+ Ha ga-aghọta na ezigbo iwe ji m maka na ha hapụrụ m,* gbakụta m azụ,+ na-achọkwa ka ha na arụsị ha niile na-asọ oyi kwaa iko.+ Ihere onwe ha ga-eme ha n’ihi ihe ọjọọ niile ha mere nakwa n’ihi arụ niile ha kpara.+
29 Ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i mehie,* ghụpụ ya tụfuo.+ N’ihi na ọ kaara gị mma ka otu anya gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị niile na Gehena.*+
16 n’ihi na ihe niile dị n’ụwa, ya bụ, ihe na-agụ anụ ahụ́ agụụ+ na ihe na-agụ anya agụụ+ na mmadụ igosi ihe ndị o nwere,* esighị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa.