-
Daniel 4:24, 25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 Eze, lekwa ihe ọ pụtara. Ọ bụ ihe Onye Kacha Elu kwuru nke ga-eme onyenwe m eze. 25 A ga-esi n’ebe ndị mmadụ bi chụpụ gị. Gị na anụ ndị bi n’ọhịa ga-ebi, ị ga na-atakwa ahịhịa ka ehi. Igirigi si n’eluigwe ga na-ede gị,+ oge asaa+ ga-agafekwa,+ ruo mgbe ị matara na ọ bụ Onye Kacha Elu na-achị n’alaeze ndị mmadụ, nakwa na ọ bụ onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ na-eme ka ọ chịwa.+
-