-
1 Samuel 12:17, 18Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 Ọ̀ bụ na oge a abụghị oge e ji ewe ọka wit n’ubi? M ga-arịọ Jehova ka o mee ka égbè eluigwe gbaa, meekwa ka mmiri zoo. Mgbe ahụ ka ọ ga-edo unu anya na ọ bụghị obere ihe ọjọọ ka unu mere n’anya Jehova mgbe unu kwuru ka a họpụtara unu eze.”+
18 Samuel wee gwa Jehova, Jehova emee ka égbè eluigwe gbaa, meekwa ka mmiri zoo n’ụbọchị ahụ, nke na ezigbo ụjọ jidere ndị Izrel niile n’ihi Jehova na Samuel.
-