-
Job 2:1-3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Mgbe e mechara, ụmụ ezi Chineke*+ bịara ka ha guzo n’ihu Jehova+ n’ụbọchị ọzọ. Setan bịakwara ka o soro ha guzo n’ihu Jehova.+
2 Jehova wee sị Setan: “Olee ebe i si bịa?” Setan zara Jehova, sị: “M nọ na-akpagharị n’ụwa, na-agagharịkwa n’ime ya.”+ 3 Jehova wee sị Setan: “Ì leruola ohu m Job anya?* Ị̀ hụla na e nweghị onye dị ka ya n’ụwa? Ọ bụ onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.*+ Ọ na-atụ egwu Chineke, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ. Ọ ka kwụsiri ike n’ebe m nọ+ n’agbanyeghị na ị na-agbalị ime ka m laa ya+ n’iyi* ọ bụ eziokwu na e nweghị ihe o mere.”
-