-
Abụ Ọma 108:2-5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 Ụbọ akwara, teta. Tetakwa, gị une.+
M ga-ebili n’isi ụtụtụ.
3 Jehova, m ga-anọ n’ihu ndị obodo dị iche iche too gị.
M ga-abụku gị abụ otuto ná mba dị iche iche.
4 N’ihi na ịhụnanya gị* dị ukwuu nke na ọ na-eru n’eluigwe,+
Ị bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe niile.*
5 Chineke, ka a jaa gị mma n’eluigwe.
Ka e too gị n’ụwa niile.+
-