Abụ Ọma 18:35 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 35 Ị na-enye m ọta gị nke na-azọpụta m.+ Aka gị siri ike* na-akwado m. Otú i si dị umeala n’obi na-eme ka m bụrụ nnukwu mmadụ.+ Abụ Ọma 21:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Aka gị ga-akpara ndị iro gị niile. Aka gị siri ike* ga-ejide ndị kpọrọ gị asị. Abụ Ọma 108:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 Biko, jiri ike* gị zọpụta anyị ma za anyị,*Ka e wee napụta ndị ị hụrụ n’anya.+ Abụ Ọma 118:15 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 15 Mkpu ọṅụ na mkpu mmeri*Na-ada n’ụlọikwuu ndị ezi omume. Aka nri Jehova na-akpa ike.+ Aịzaya 41:10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka.+ M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.’
35 Ị na-enye m ọta gị nke na-azọpụta m.+ Aka gị siri ike* na-akwado m. Otú i si dị umeala n’obi na-eme ka m bụrụ nnukwu mmadụ.+
10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka.+ M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.’