26 Jehova kwuru, sị: ‘Ahụrụ m otú e si gbuo Nebọt+ na ụmụ ya ụnyaahụ.’ Jehova kwukwara, sị: “Ọ bụkwa n’ala a ka m ga-akwụ gị ụgwọ+ ihe a i mere.” N’ihi ya, bulite ya ma tụba ya n’ala ahụ otú Jehova kwuru.”+
23 biko, nọrọ n’eluigwe nụrụ, meekwa ihe gbasara ya. Kpeere ndị ohu gị ikpe. Mee ka onye ajọ omume buru ihe o metara,+ ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ ya. Kwuokwa na aka onye ezi omume dị ọcha,* kwụọkwa ya ụgwọ maka ezi omume ya.+