-
Joshụa 24:12, 13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 M mere ka ike ịlụso unu agha gwụ ha niile, nke na ndị eze abụọ na-achị ndị Amọraịt gbara ọsọ n’ihi unu.+ Ọ bụghị mma agha unu ma ọ bụ ụta unu mere ha ji gbaa ọsọ.+ 13 Otú a ka m si nye unu ala unu na-agbaghị mbọ nweta, nyekwa unu obodo ndị unu na-arụghị,+ unu ebiri n’ime ha. Ọ bụkwa ihe si n’ubi vaịn na ubi oliv unu na-akụghị ka unu na-eri.’+
-
-
1 Ndị Eze 4:25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 N’oge niile Solomọn na-achị, obi ruru ndị Juda na ndị Izrel ala. Onye ọ bụla n’ime ha bikwa n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya, malite na Dan ruo Bia-shiba.
-