-
Ọpụpụ 20:2-5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 “Abụ m Jehova Chineke gị, onye kpọpụtara gị n’Ijipt, bụ́ ebe ị nọ na-agba ohu.*+ 3 Enwela chi ọ bụla ọzọ ma e wepụ m.+
4 “Emerela onwe gị arụsị a pịrị apị ma ọ bụ ihe yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ ihe dị n’ụwa ma ọ bụ ihe dị na mmiri ndị dị n’ụwa.+ 5 Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka a rata gị ka i fee ha ofufe,+ n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ka a na-efe naanị ya ofufe.+ M na-ata ụmụ ndị kpọrọ m asị ahụhụ, na-atakwa ọgbọ ha nke atọ nakwa ọgbọ ha nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha.
-