-
Mkpughe 7:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Mgbe ihe ndị a gachara, ka m nọ na-ele anya, ahụrụ m oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yi uwe mwụda na-acha ọcha,+ jirikwa igu nkwụ n’aka.+ Ha si ná mba niile na ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile.+ 10 Ha jikwa oké olu na-eti mkpu, sị: “Ọ bụ Chineke anyị, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ,+ nakwa Nwa Atụrụ ahụ zọpụtara anyị.”+
-