10 “N’oge dị iche iche unu na-aṅụrị ọṅụ,+ ya bụ, n’oge ememme+ unu nakwa ná mbido ọnwa unu, unu ga-afụ opi mgbe unu na-achụ àjà unu a na-esu ọkụ+ na àjà udo unu.+ Ịfụ opi ndị ahụ ga-eme ka Chineke unu cheta unu. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.”+
28 Ka ndị Izrel niile bu igbe ọgbụgba ndụ Jehova na-alọta, ha nọ na-eti mkpu, na-aṅụrị ọṅụ,+ na-afụ opi dị iche iche,+ na-akụ ájà, na-akpọsikwa ụbọ akwara na une ike.+
27 Hezekaya gwaziri ha ka ha chụọ àjà a na-esu ọkụ n’elu ebe ịchụàjà.+ Mgbe ha malitere ịchụ ya, ndị na-abụ abụ malitere ịbụrụ Jehova abụ, ndị na-afụ opi amalitekwa ịfụ opi. Ha nọ na-afụ ya ka ya na abụ e ji ngwá egwú Devid eze Izrel na-abụ na-adakọ.