-
Levitikọs 16:21, 22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
21 Erọn ga-ebikwasị aka ya abụọ n’isi mkpi ahụ dị ndụ ma kwupụta ihe ọjọọ niile ndị Izrel mere na nnupụisi ha niile na mmehie ha niile n’isi mkpi ahụ. Ọ ga-eme ka ha dịrị n’isi mkpi ahụ.+ Ọ ga-edunyezi otu nwoke a họpụtara* ka ọ kpụrụ mkpi ahụ kpụga ya n’ala ịkpa. 22 Mkpi ahụ ga-eburu mmehie ha niile+ banye n’ọzara.+ Ọ ga-akpụga mkpi ahụ n’ala ịkpa.+
-