-
Job 38:8-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Ònye mechibidoro oké osimiri ụzọ+
Mgbe o si n’ebe o si asọpụta* sọpụtasiwe ike,
9 Mgbe m yiwere ya ígwé ojii ka uwe,
Jirikwa oké ọchịchịrị kee ya ka ákwà,
10 Mgbe m kpaara ya ókè,
Tinyekwa ihe e ji atụchi ya nakwa ibo ụzọ ya,+
-
Ilu 8:29Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 Mgbe o nyere oké osimiri iwu
Ka mmiri ya ghara ịgafe ókè ọ kpaara ya,+
Mgbe ọ tọrọ ntọala ụwa,
-
Jeremaya 5:22Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
22 Jehova kwuru, sị, ‘Gịnị mere na unu anaghị asọpụrụ m?
Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị ịma jijiji n’ihi m?
Ọ bụ mụnwa ji ájá kpaara oké osimiri ókè.
Ọ ga-adịgidekwa otú ahụ. Ọ gaghị asọfeli ókè ya.
Ọ bụ eziokwu na mmiri ya ga na-amali elu, ma ọ gaghị asọfeli ókè ya.
Ọ bụ eziokwu na ọ na-eme mkpọtụ, ma ọ gaghị asọfeli ókè ya.+
-
-
-
-
-