Job 38:37 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 37 Ònye ma ihe nke na ọ ga-agụli ígwé ojii ọnụ? Ma ọ bụ, ònye nwere ike ikpu ite mmiri ndị dị n’eluigwe ihu?+ Abụ Ọma 147:8 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 8 Onye ji ígwé ojii kpuchie eluigwe,Onye na-eme ka mmiri zooro ụwa,+Onye na-eme ka ahịhịa ndụ puo+ n’ugwu dị iche iche. Jeremaya 10:13 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 13 Olu ya na-emeKa mmiri dị n’eluigwe mee mkpatụ.+ Yanwa na-emekwa ka alụlụụ* si n’ebe niile ụwa sọtụrụ na-akwụgo elu.+ Ọ na-eme ka àmụ̀mà na-egbu mgbe mmiri na-ezo.* Ọ na-emekwa ka ifufe si n’ebe ọ na-adị pụta.+ Emọs 9:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 ‘Jehova bụ aha+Onye na-arụ ụzọ e si aga n’eluigwe,Na-arụkwa ihe o ji ekpuchi ụwa,Onye na-eme ka oké osimiri gbakọta,Ka ọ wụsa ya n’elu ala.’+ Matiu 5:45 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 45 ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe,+ n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma. Ọ na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.+
37 Ònye ma ihe nke na ọ ga-agụli ígwé ojii ọnụ? Ma ọ bụ, ònye nwere ike ikpu ite mmiri ndị dị n’eluigwe ihu?+
8 Onye ji ígwé ojii kpuchie eluigwe,Onye na-eme ka mmiri zooro ụwa,+Onye na-eme ka ahịhịa ndụ puo+ n’ugwu dị iche iche.
13 Olu ya na-emeKa mmiri dị n’eluigwe mee mkpatụ.+ Yanwa na-emekwa ka alụlụụ* si n’ebe niile ụwa sọtụrụ na-akwụgo elu.+ Ọ na-eme ka àmụ̀mà na-egbu mgbe mmiri na-ezo.* Ọ na-emekwa ka ifufe si n’ebe ọ na-adị pụta.+
6 ‘Jehova bụ aha+Onye na-arụ ụzọ e si aga n’eluigwe,Na-arụkwa ihe o ji ekpuchi ụwa,Onye na-eme ka oké osimiri gbakọta,Ka ọ wụsa ya n’elu ala.’+
45 ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe,+ n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma. Ọ na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.+