-
Ọpụpụ 30:34-36Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
34 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Weta ihe ndị a na-esi ísì ọma:+ mmanụ stakti, ọnịka na-esi ísì ọma, galbanọm na-esi ísì ọma, na frankinsens a na-agwaghị agwa. Otú otu hà ka ibe ya ga-aha. 35 Jiri ha mee insens.*+ A ga-agwakọta ha nke ọma,* tinye ya nnu.+ A gaghị etinye ya ihe ọzọ, ọ ga-adịkwa nsọ. 36 Ị ga-asụ ụfọdụ n’ime ya nke ọma ka ọ dị ka ntụ ma dowe ụfọdụ n’ime ya n’ihu igbe ọgbụgba ndụ* ahụ dị n’ụlọikwuu nzute, bụ́ ebe m ga na-apụta n’ihu gị. Ọ ga-abụrụ unu ihe kacha nsọ.
-