2 Ọ bụrụ, sị:
“Jehova bụ nkume m dị elu na ebe m a rụsiri ike+ na Onye na-anapụta m.+
3 Chineke m bụ oké nkume m.+ M na-agbaba n’ime ya.
Ọ bụ ọta m+ na mpi nke na-azọpụta m. Ọ bụ ebe m na-agbaba, aka aghara ịkpa m,+
Ọ bụ ebe m na-agbaga ọsọ ndụ+ na onye nzọpụta m.+ Ọ na-anapụta m n’aka ndị tigbuo zọgbuo.