15 Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị?
Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị?+
2 Ọ bụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta,+
Onye na-eme ezi ihe,+
Onye na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.+
3 Ọ naghị ekwutọ mmadụ.+
Ọ naghị eme onye agbata obi ya ihe ọjọọ,+
Ọ naghịkwa ekwujọ ndị enyi ya.+
4 Ọ naghị anabata onye ọ bụla na-abaghị uru,+
Ma ọ na-akwanyere ndị na-atụ egwu Jehova ùgwù.
Ọ na-emezu nkwa o kwere, ọ bụrụgodị na imezu ya ga-akpa ya aka ọjọọ.+
5 Ọ naghị ana ọmụrụ nwa ma ọ gbazinye mmadụ ego,+
Ọ naghịkwa ana aka azụ ka e megbuo onye aka ya dị ọcha.+
A gaghị eme ka onye ọ bụla na-eme ihe ndị a daa.+