15 Jahazayel wee sị: “Ndị Juda niile na ndị bi na Jeruselem, nakwa Eze Jehoshafat, geenụ ntị. Nụrụnụ ihe Jehova gwara unu. Ọ sịrị: ‘Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihi ìgwè mmadụ a. Agha a abụghị nke unu, kama ọ bụ nke Chineke.+
7 “Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike. Unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ n’ihi eze Asiria+ nakwa n’ihi ìgwè mmadụ so ya, maka na ndị nọnyeere anyị karịrị ndị nọnyeere ya.+