16 Ha wee sị ya: “Ị̀ na-anụ ihe ndị a na-ekwu?” Jizọs asị ha: “Ee. Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe e dere, sị, ‘I meela ka ọnụ ụmụaka na ụmụ ọhụrụ too gị’?”+
21 N’oge ahụ, mmụọ nsọ mere ka ọṅụ ju Jizọs obi, ya asị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m eto gị n’ihu ọha n’ihi na i zochiiri ndị ma ihe na ndị ọkachamara+ ihe ndị a nke ọma ma mee ka ụmụaka mara ha. Nna, ọ bụ otú ị chọrọ ya.+
27 Ma, Chineke họọrọ ndị ụwa weere na ha amaghị ihe iji menye ndị amamihe ihere. Chineke họkwaara ndị ụwa weere na ha esighị ike iji menye ndị siri ike ihere.+