7 Ma Jehova sịrị Samuel: “Elela otú ọ dị n’anya na otú o toruru ogologo,+ maka na ọ bụghị ya ka m họọrọ. N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ. Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”+
3 “Jehova, biko, ana m arịọ gị ka i cheta otú m si jiri obi m niile na-eso gị mgbe niile, na otú m si mee ihe dị mma n’anya gị.”+ Hezekaya bewere ákwá, na-ebesi ya ike.
17 Chineke m, ama m nke ọma na ị na-enyocha obi,+ nakwa na ihe onye na-akwụwa aka ọtọ*+ na-atọ gị ụtọ. M ji obi ọcha m nye ihe ndị a niile. Obi dịkwa m ụtọ ịhụ ka ndị gị bịara ebe a ji obi ha niile na-enye gị onyinye.