-
Levitikọs 14:3, 4Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Onye nchụàjà ga-esi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu pụọ gaa leruo ya anya. Ọ bụrụ na ekpenta ya alaala, 4 onye nchụàjà ga-enye ya iwu ka ọ nwụta nnụnụ abụọ dị ndụ bụ́ ndị na-esoghị ná nnụnụ ndị na-adịghị ọcha, wetakwa osisi sida, ákwà na-acha uhie uhie, na ahịhịa hisop ka e jiri ha mee ka ọ dị ọcha.+
-
-
Ndị Hibru 9:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 N’ihi na ọ bụrụ na ọbara ewu na nke oké ehi+ na ntụ ehi e fesara ndị na-adịghị ọcha na-edo ha nsọ ma mee ka ahụ́ ha dị ọcha,+ 14 o doro anya na ọbara Kraịst ga-eme ihe karịrị ihe ọbara ndị ahụ mere.+ Mmụọ ebighị ebi duziri ya, ya enyefee Chineke onwe ya ka àjà a na-emerụghị emerụ. Ọbara ya na-asachapụ ọrụ dị iche iche na-abaghị uru* n’akọnuche anyị+ ka anyị wee na-ejere Chineke dị ndụ ozi dị nsọ.+
-