Ezikiel 7:19 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 19 “‘Ha ga-atụfu ọlaọcha ha n’okporo ámá. Ọlaedo ha ga na-asọkwa ha oyi. Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị azọpụtali ha n’ụbọchị oké iwe Jehova.+ Afọ agaghị eju ha.* Ha agaghịkwa enyeju onwe ha afọ, n’ihi na ọ* ghọọla ihe na-eme ka ha mehie.* Matiu 16:26 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 26 N’eziokwu, olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ* ya?+ Ma ọ bụ, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ* ya?+
19 “‘Ha ga-atụfu ọlaọcha ha n’okporo ámá. Ọlaedo ha ga na-asọkwa ha oyi. Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị azọpụtali ha n’ụbọchị oké iwe Jehova.+ Afọ agaghị eju ha.* Ha agaghịkwa enyeju onwe ha afọ, n’ihi na ọ* ghọọla ihe na-eme ka ha mehie.*
26 N’eziokwu, olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ* ya?+ Ma ọ bụ, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ* ya?+