-
Daniel 6:23, 24Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 Obi tọrọ eze ezigbo ụtọ. O wee nye iwu ka a kpọpụta Daniel n’olulu ahụ. Mgbe a kpọpụtara Daniel n’olulu ahụ, e nweghị ihe ọ bụla mere ya maka na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.+
24 Eze nyeziri iwu, e wee kpọta ndị ahụ boro Daniel ebubo. A tụbara ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha n’olulu ọdụm ahụ. Ha adarubeghị n’ala olulu ahụ mgbe ọdụm ndị ahụ kpaara ha aka dọrie ha ma tapịa ọkpụkpụ ha niile.+
-