15 E nweghị ike iji ezigbo ọlaedo zụta ya,
E nweghịkwa otú a ga-atụru ọlaọcha jiri gbanweta ya.+
16 E nweghị ike iji ọlaedo kacha mma zụta ya,+
Ma ọ bụkwanụ jiri nkume ọnịks na nkume safaya dị oké ọnụ zụta ya.
17 A gaghị ejili ọlaedo na enyo tụnyere ya.
E nweghịkwa ike iji arịa e ji ezigbo ọlaedo mee gbanweta ya.+
18 A gaghịdị eji nkume kọral na nkume kristal tụnyere ya,+
N’ihi na akpa nke amamihe juru bara uru karịa nke nkume pel juru.