-
Ndị Rom 1:20, 21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 N’ihi na e leruo otú e si kee ụwa anya, a na-ahụ àgwà ya ndị a na-anaghị ahụ anya. Ihe ndị o kere na-eme ka a ghọta ụdị onye ọ bụ.+ Ha na-eme ka a mata na ike ya na-adịru ebighị ebi+ nakwa na ọ bụ Chineke.+ Ndị na-eleghara ihe ndị a anya enweghị ihe mere ha ga-eji kwuo na Chineke adịghị. 21 N’agbanyeghị na ha ma Chineke, ha etoghị ya otú e kwesịrị ito Chineke, ha ekeleghịkwa ya, kama ha chewere echiche ka ndị na-anaghị aghọta ihe, obi ha nke kpọchiri akpọchi gbakwara ọchịchịrị.+
-