-
Diuterọnọmi 1:16, 17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 “N’oge ahụ, m gwara ndị ikpe unu, sị, ‘Mgbe unu na-ekpere ụmụnne unu ikpe, kpeenụ ikpe ziri ezi+ n’etiti mmadụ na nwanne ya ma ọ bụ onye mbịarambịa.+ 17 Unu elela mmadụ anya n’ihu mgbe unu na-ekpe ikpe.+ Unu ga-ege ma onye ukwu ma onye nta ntị.+ Unu atụla mmadụ egwu+ n’ihi na ọ bụ Chineke ka unu na-ekpere ikpe.+ E nwee ikpe siiri unu oké ike, unu ga-ewetara m ya, m ga-elebakwa ya anya.’+
-