38 Ka ihe si kwụrụ ugbu a, ana m asị unu, unu akpala ndị a aka, kama hapụnụ ha. Ọ bụrụ na atụmatụ ha ma ọ bụ ihe a ha na-eme si n’aka mmadụ, ọ ga-akụ afọ n’ala. 39 Ma ọ bụrụ na o si n’aka Chineke, unu agaghị akwụsịli ha.+ Kpacharanụ anya, n’ihi na o nwedịrị ike ịbụ na unu na-alụso Chineke ọgụ.”+