-
Ilu 6:1-3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbata obi gị n’ibé,+
Ọ bụrụ na e nwere ihe gị na onye ị na-amaghị kwekọrịtara,*+
2 Ọ bụrụ na nkwa i kwere arapụtala gị,
Ọ bụrụ na ihe i ji ọnụ gị kwuo etinyela gị ná nsogbu,+
3 Nwa m, ebe ọ bụ na ị banyela n’aka mmadụ ibe gị,
Mee ihe a ka ị gbara isi gị:
Gakwuru onye ahụ ozugbo. Weda onwe gị ala rịọ ya arịrịọ.+
-