-
1 Samuel 16:18, 19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
18 Otu n’ime ndị na-ejere ya ozi sịrị ya: “Ahụla m otú nwa Jesi onye Betlehem si akpọ ụbọ ka aka ochie. Obi kara ya. Ọ bụkwa dike n’agha.+ Ọ ma ka e si ekwu okwu, maakwa mma.+ Jehova nọnyekwaara ya.”+ 19 Sọl wee ziga ndị ozi ya ka ha zie Jesi, sị: “Biko, zitere m Devid nwa gị, onye na-elekọta ìgwè ewu na atụrụ.”+
-
-
1 Ndị Eze 7:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Eze Solomọn ziri ozi, e si Taya kpọta Haịram.+ 14 Ọ bụ nwa otu nwaanyị isi mkpe nke si n’ebo Naftalaị. Nna ya bụ onye Taya, onye na-arụ ọrụ ọla kọpa.+ Haịram nwere ezigbo nkà. Ọrụ ya doro ya anya.+ Ọ bụkwa aka ochie n’ụdị ọrụ ọ bụla a na-eji ọla kọpa* arụ. Ọ bịakwutere Eze Solomọn ma rụọ ọrụ niile o nyere ya.
-