7 Unu kwesịrị ịna-atachi obi ma were ya na e si otú a na-adọ unu aka ná ntị.* Chineke na-emeso unu ka ụmụ ya.+ Ka è nwere nwa nna ya na-anaghị adọ aka ná ntị?+
9 Ndị nna mụrụ anyị na-adị adọ anyị aka ná ntị, anyị na-akwanyekwara ha ùgwù. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ido onwe anyị n’okpuru Nna nke ji mmụọ nsọ ya họpụta anyị ka anyị wee dị ndụ?+