-
2 Samuel 20:9, 10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
9 Joab wee jụọ Amesa, sị: “Nwanne m, ị̀ dịkwa mma?” Joab bịakwara jiri aka nri ya jide Amesa n’afụ ọnụ ka à ga-asị na ọ chọrọ isusu ya ọnụ. 10 Ma anya Amesa adịghị ná mma agha Joab ji n’aka. Joab wee were ya maa ya n’afọ,+ eriri afọ ya awụpụtasịa n’ala. Ọ maghịzi ya ọzọ. Otu nke ahụ ọ mara ya gburu ya. Joab na Abishaị nwanne ya nwoke achụrụzie Shiba nwa Bikraị gawa.
-