15 Otú ahụ mmadụ na-agba aka si n’afọ nne ya pụta, ka ọ ga-agba aka laa.+ E nweghịkwa ihe ọ bụla ọ ga-ewere laa n’agbanyeghị ọrụ niile ọ rụsiri ike.+
16 Ihe a jọgbukwara onwe ya: Otú mmadụ dị mgbe a mụrụ ya ka ọ ga-adị laa. Oleekwanụ uru onye nọ na-agbasi mbọ ike na-achụ ifufe ritere?+