12 Nwa agbọghọ nke ọ bụla ga-agakwuru Eze Ahazuirọs ma ọnwa iri na abụọ e ji achọ ya mma gachaa. Otú a ga-esi chọọ onye nke ọ bụla mma* bụ: A ga-eji ọnwa isii tee ya mmanụ e ji mea mee,+ jirikwa ọnwa isii tee ya mmanụ balsam+ na mmanụ otite ndị ọzọ e ji achọ mma.*