-
2 Ihe E Mere 1:16, 17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Solomọn sikwa n’Ijipt+ na-atụbata ịnyịnya. Ọ bụkwa ndị na-azụrụ ya ahịa na-atụbata ha n’ìgwè n’ìgwè.*+ 17 Ha na-eji narị mkpụrụ ego ọlaọcha isii (600) esi n’Ijipt atụbata otu ụgbọ ịnyịnya, na-ejikwa otu narị mkpụrụ ego ọlaọcha na iri ise (150) atụbata otu ịnyịnya. Ha na-eresịkwa ha ndị eze niile na-achị ndị Het na ndị nke na-achị ndị Siria.
-