-
Aịzaya 44:14, 15Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 E nwere onye ọrụ ya bụ igbutu osisi sida.
A bịakwa n’osisi ndị ọzọ dị n’oké ọhịa,
O nwere ike ịhọrọ osisi ook, hapụ ya ka ọ kaa akaa.+
O nwekwara ike ịkụ osisi lọrel, mmiri ozuzo emee ka o too.
15 Mmadụ na-eji osisi ahụ mere nkụ.
Ọ na-egbute nke ọ ga-eji nyaa ọkụ.
Ọ na-akwanye ọkụ, jiri ya mee achịcha.
Ma, ọ na-ejikwa osisi ahụ apị chi, na-efekwa ya.
Ọ na-eji osisi ahụ apị arụsị, na-akpọkwara ya isiala.+
-