22 N’ikpeazụ, Chineke chetara Rechel. Chineke wee nụ olu ya, za ya ekpere ma mee ka o nwee ike ịdị ime.*+23 O wee dị ime mụọ nwa nwoke, sị: “Chineke ewepụla nkọcha a na-akọcha m.”+
24 Ka ụbọchị ole na ole gara, Elizabet nwunye ya bịara dịrị ime, wee nọrọ n’ụlọ ọnwa ise n’apụtaghị apụta. Ọ sịrị: 25 “Nke a bụ otú Jehova* si mesoo m. O cheela ihu ebe m nọ iji wepụ nkọcha ndị mmadụ na-akọcha m.”+