-
Aịzaya 44:16, 17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Ọ na-etinye ọkara ya ọkụ.
Ọ na-eji ya ahụ anụ ọ ga-ata. Ya tachaa, afọ eju ya.
Ọ na-anyakwa ọkụ, sị:
“Ehee! Ahụ́ ekporola m ọkụ ka m na-ele ọkụ a.”
17 Ma, ọ na-eji nke fọrọ afọ pịa chi, ya abụrụ arụsị a pịrị apị.
Ọ na-akpọrọ ya isiala, na-efekwa ya.
Ọ na-arịọ ya, sị:
“Zọpụta m, n’ihi na ị bụ chi m.”+
-
-
Daniel 3:5Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
5 na mgbe unu nụrụ ụda opi, ọjà, ụbọ zita, une, ụbọ akwara, nnukwu ọjà, na ụdị ngwá egwú niile ọzọ, daanụ n’ala kpọọrọ ihe ahụ Eze Nebukadneza ji ọlaedo kpụọ isiala.
-