37 Mgbe ihe a mechara, Senakerib eze Asiria laghachiri Ninive,+ nọrọkwa ebe ahụ.+ 38 Ka ọ nọ na-akpọ isiala n’ụlọ chi ya bụ́ Nisrọk, ụmụ ya, bụ́ Adramelek na Shariza, weere mma agha gbuo ya+ ma gbaga Ararat.+ Isa-hadọn+ nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.