22 Ndị Juda nọkwa na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+ Ihe ọjọọ ha mere kpasukwara ya iwe karịa otú ihe ọjọọ ndị nna nna ha mere kpasuru ya.+ 23 Hanwa nọkwa na-arụ ebe ndị dị elu, ogidi arụsị, na ogwe osisi arụsị+ n’ugwu ọ bụla dị elu+ nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko.+