-
Aịzaya 56:6, 7Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Ndị mba ọzọ, ndị bịara ka ha soro na-efe Jehova,
Ka ha hụ Jehova n’anya, jiri aha ya kpọrọ ihe,+
Bụrụkwa ndị ohu ya,
Ndị niile na-edebe Ụbọchị Izu Ike, ndị na-anaghịkwa emerụ ya,
Ndị na-ahapụghịkwa ọgbụgba ndụ m,
7 M ga-akpọrọ ha bịa n’ugwu nsọ m,+
Meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ụlọ ekpere m.
M ga-anabata àjà a na-esucha ọkụ na àjà ndị ọzọ ha ga-achụ n’elu ebe ịchụàjà m.
N’ihi na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere maka mba niile.”+
-
-
Aịzaya 66:20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
20 Ha ga-esi ná mba niile jiri ịnyịnya, ụgbọ ịnyịnya, ụgbọala ndị e mechiri elu ha emechi, jakị, na kamel ndị na-awụ ọsọ bute ụmụnne unu niile+ n’ugwu nsọ m, bụ́ Jeruselem, ka ha bụrụ onyinye a ga-enye Jehova, otú ahụ ndị Izrel na-eji arịa dị ọcha ebubata onyinye n’ụlọ Jehova.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
-