-
Nehemaya 2:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 M wee sị eze: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka e nye m akwụkwọ ozi ndị m ga-enye ndị gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis,*+ ka ha kwe ka m gafere ruo mgbe m ga-agaru Juda, 8 nakwa akwụkwọ ozi m ga-enye Esaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o bunye m osisi ndị m ga-eji rụọ ọnụ ụzọ ámá Ebe A Rụsiri Ike+ n’Ụlọ Nsọ, rụọ mgbidi obodo ahụ,+ nakwa ụlọ m ga-ebi.” Eze wee nye m ha+ n’ihi na Chineke m nọnyeere m.+
-