6Jehova wee gwa Mosis, sị: “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero.+ M ga-eji aka m dị ike manye ya ka ọ hapụ ha ka ha laa, jirikwa aka m dị ike manye ya ka ọ chụpụ ha n’ala ya.”+
6 “N’ihi ya, gwa ndị Izrel, sị: ‘Abụ m Jehova. M ga-akpọpụta unu n’aka ndị Ijipt ka unu kwụsị ịrụgbu onwe unu n’ọrụ, meekwa ka unu kwụsị ịgbara ha ohu.+ M ga-eji aka m siri ike napụta unu ma taa ndị Ijipt nnukwu ahụhụ.+